Its All About BLUE

Welcome to blue's site. Feel free to gimme any corrections what's ever. Checkout the YouTube videos by your right. For your pleasure only. Don't forget to Google+ me.

Thursday 4 June 2015

Ịkwalite Asụsụ Igbo nke na-anwu anwu


Ịkwalite Asụsụ Igbo



Ndị Igbo bụ ndi a ga-ahụ nke ọma na Steeti ise dị n’ala Naịjirịa. Steeti ndi ahụ gụnyere Anambara, Imo, Abịa, Enugu na Ebonyi. N’agbanyeghị na ha bụcha otu ndị, enwere ọtụtụ ndiiche dị n’asụsụ Igbo.
Ndi Igbo bụkwa ndị n’agba mbọ nke ọma nke bụ n’ebe ọbụla ha hụrụ onwe ha, ha n’anọgharinwu nweta onwe ha ma mee ebe ahụ ọ mara ha ahụ. Nnukwu mbọ a ha n’agba emeela ha, ha abụrụ ndi n’eje ije nke ukwu, ịchọgharị ebe ga-adịrị ha mma maka ịnweta ihe oriri, ụlọ obibi na mkpa ndị ọzọ dị na ndụ a. Ọzọkwa bụ, iji were nọgharịa ka ebe ha nọ were mara ha ahụ, e nwere ike inwe mkpa na ha ga-amụta asụsụ ndi ebe ha nọ. Ịmụta asụsụ na ọmenaala obodo ọzọ maọbụ ndị ọzọ adịghị njọ mana ebe ọ ga-ebido dịba njọ bụ ma onye ahụ chefuo asụsụ na ọmenaala agbụrụ ya.
A bia na ala Naijiria, ọtụtụ ndị Igbo weere asụsụ na ọmenaala oyibo dịka nke makarịsịnụ karia asụsụ na ọmenaala Igbo. Nke a kpatara na ha adịghị agba mbọ kwesịrị n’ikuziri ụmụ ha asụsụ na ọmenaala Igbo. Ụdiri ihe a n’eme na-aga n’ihu, ọnwere mgbe ọ ga-eru, asụsụ na ọmenaala Igbo abụrụzia ihe a na-akọ n’akụkọ dịka asụsụ Latin.
Ọtụtụ ihe kpatara ọnwunwụ Igbo
a.       Oke ñnomi ọmenaala ndị oyibo
b.      Ịme ihere na ụjọ ịtụ mmadu ịsu asụsụ Igbo n’ebe ndi agbụrụ ọzọ nọ. Ya bu ịnwe ihe oyibo kpọrọ ‘Inferiority complex’.
c.       Agbụrụ nọ n’ọchịchị nwekwara aka n’ikwalite maọbụ ịnyụkọ otu asụsụ. Ya bụ, agbụrụ ndi na-asụ oyibo n’akwalite asụsụ ha nke ukwu n’ihi na ha ji usoro ịkpatakụ nke ụwa (World Economy).
Uru Asụsụ Igbo anyi bara
a.       Ọ na-ewelite mmekọrịta dịka nwanne ọkachasị ha hụ onwe ha ebe di anya
b.      Ndị Igbo hụrụ onwe ha n’obodo ọzọ nwere ike ịkarinwu nkata nke na ndi ọzọ agaghi aghọta ihe ha na-akarị.
Uru di n’ịsụ Igbo buru ibu nke na a gaghi m akpọsịnwu ya tata.
Ihe enwere ike ime were kwalite asụsụ Igbo
Enwegasịrị otu dị maka ịkwalite asụsụ Igbo dịka: “Society for the promotion of Igbo language and Culture” nke Chidozie F. Ogbaru na ndi otu ya bidoro n’afọ 1949.
Mana otu ndị a adịghị agbazị mbọ otu ha dị mgbe e bidoro ha. A dịghị anụzi olu “Society for the promotion of Igbo language and Culture” nke e ji anụ olu “Sụbakwa Asụsụ Igbo”
-          E nwere ike ịkpọte otu ndị a n’ụra maọbụ mebe ndị ọhụrụ
-          E nwere ike ime asụsụ Igbo otu n’ime ihe ọmụmu a na-amu n’ụlọakwụkwọ pramarị
-          Ịkwalite mmụọ ndị nne na nna iji asụsụ na ọmenaala Igbo were zụọ ụmụ ha.
-          Ịme otụtụ ihe emume dịka ịka ụka, ịme ejije na mmemme ndị ọzọ n’asụsụ Igbo
-          Ịkwalite akụkọ ndi nna nna anyi na etu ha si bi ndụ ha.
-          Ịtụgharị akụkọ ochie ndi di n’oyibo (classics) n’asụsụ Igbo
-          Ịrụ ọtụtụ ‘website’ n’asụsụ Igbo
-          Ịkwalite ndị n’ekwusa maka ngwa ahịa ha na ihe achọrọ ka ọha mara n’asụsụ Igbo (ya bụ advertisers)
-          Ịmebe Iwu na Steeti ise na Naijiria a na-asụ Igbo na ha nke n’enwere ike ịnwe ọgbakọ nke ndị Ntiwu (House of Assembly) n’asụsụ Igbo.
-          Ịwepụta Dikishọnarị n’asụsụ Igbo
-          Ịkwalite ibi ọtụtụ akwụkwọ n’asụsụ Igbo
-          Ịkwado oghere ịsị ụmụakwụkwọ mere nke ọma n’Igbo daalụ. Enwere ike ịnyekwa ụmụakwụkwọ nwere mmasi n’ihe gbasara Igbo ohere ịgụ Igbo na Mahadum n’efu (scholarship). Ihe nnye nnye a agaghị abụ sọ ebe ụmụakwukwo nọ. Ọ ga-erutekwa ndị mepụtara ihe eji eme ọnụ n’asụsụ Igbo.
-          Ịmepụta ọtụtụ muvi n’asụsụ Igbo

-          Ịkwalite iji asụsụ Igbo were ziputa ọtụtụ mmemme n’igwe onyonyo na redio.

O ka mma ma Ebido n'oge chuba ewu ojii n'ihi na chi jie, ya na abali aburu otu.
Ndeewo maka iweputa oge gi guo ihe ederede a.
I nwere ike ile ihe nkiri maka ederede a na YouTube site na http://youtu.be/OFm7jYWsIiU?list=PLGkVoKrdEjIGVUAGAYcrUhe-LWrP1tV8a

Ka I were mara nke oma maka asusu Igbo, jee ebea www.igboguide.org maobu www.igboradio.com

0 comments:

Post a Comment